FeaturedIgbo News

Buhari, ndị minister, na ndịisi ụlọ ọrụ ụfọdụ agaa Saudi Arabia

Views

Onyeisi ala Muhammadu Buhari ahapụla Abuja na Mọnde, gawa Riyadh, nke dị na Saudi Arabia maka emume Future Investment Initiative (FII).

Garba Shehu, onye nkwuchite ọnụ onyeisi ala, kwuru nke. O kwuru na ndị kwadoro emume a bụ Public Investment Fund (PIF) nke Saudi Arabia.

Shehu kwuru na isiokwu emume a bụ, ‘What’s next for Global Business?’. O kwuru na emume ga-ebido n’ụbọchị iri abụọ na otu ruo ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọktoba.

Buhari ga-eji ohere kwupụta mkpa ọ dị na ndi Naijiria na Saudi Arabia ga-arụkọ ọrụ iji mezie azụmahịa na Naijiria nakwa ihe gbasara mmanụ na mmepụta ya.

Leave a Reply