FeaturedIgbo News

Buhari kwesiri inye ndị minister iwu ka ha were ụgbọala na-eme njem – Onanuga

Views

Onye ntụziaka gara aga nke ụlọọrụ News Agency of Nigeria, Mz. Bayo Onanuga, adụịla Onyeisi ala Muhammadu Buhari ọdụ, ka o nye iwu nke ga-eme ka ndị mimista kwụsị iji ụgbọelu eme njem na Naijiria.

Kama, o kwuru na Buhari nye iwu ka ha na aga n’ụzọ, opekampe otu ugboro n’afọ.

N’ụzọ dị otu a, Onyeisi ala na ndị otu ya ga-amara na ụfọdụ ụzọ dị na Naijiria adịghị mma ọgịga. Ha ga-aghọtakwa na #260bn ewepụtara maka mmefu ego 2020 abaghị uru.

Onanuga kwuru nke a na mmeghachiahụ okwu minister nke ọrụ na ụlọ, Babatunde Fashola kwuru.

Fashola kwuru na ụzọ Naijiria ajọghị njọ otu ndị Naijiria siri kọwa.

Leave a Reply