Igbo News

Buhari ezigara ndi Naijiria bi mba ofesi ozi

Views

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela ndi Naijiria bi na mba ofesi maka otu ha si ebi n’udo n’obodo ha bi n’ime ya.

Buhari kwupụtara nke a mgbe ndi ‘Progressive Ambassadors of Nigeria (PAN)’ bịara ileta ya n’Abuja n’ụbọchị Tuzde. O gbara ndi Naijiria bi na mba ụwa ume ka ha mara ihe ndi obodo ahụ asọ ma na-eme ya ka wee nwee ezi mmekọrịta.

Onyeisi ala gosikwara mmasị ya na-ebe ndi otu PAN nọ nakwa n’aha nke ha họrọ iza.

Comrade Emenike Jasper bụ onyeisi ndi PAN kwuru na PAN bụ otu na-esoghi ọchịchị gọọmenti ma na enweghikwa uru di na ya. O kelere Muhammadu Buhari maka mmeri ya na ntụliaka e mere. O kelekwara ya maka enyemaka o nyere ndi Naijiria bi Ghana site na imepe ụlọ ahịa nari anọ n’ọnwa Oktoba, afọ 2018. O kwuputara nkwado ha n’ọchịchị ya nke a.

Leave a Reply