FeaturedIgbo News

Buhari enyela iwu ka achọwa ndi gburugburu ụkọchukwu katọlịk n’Enugu

Views

Onyeisi ala Muhammadu Buhari enyela iwu ka achọwa ndi gburu ụkọchukwu ndi katọlịk, Rev. Fr. Paul Offu.

Offu bụ ụkọchukwu nke na-aka ụka na Greater Parish Catholic Church, nke dị n’Ugbawka, Enugu Steeti. Ogbugbu egburu ụkọchukwu a mere ndi ụkọchukwu ndi ọzọ jiri nwee ngaghari iwe n’Enugu na Fraide. Ha gara n’ọfiisi Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi, arịọ ka o megharia ahụ maka ihe a mere.

Onyeisi ala, n’okwu o kwuru site n’ọnụ Senior Special Assistant, Mz. Garba Shehu na Satọde, na obi adịghị onyeisi ala mma maka ihe ọjọọ merenu ma na-arịọ ndi ezinaụlọ ụkọchukwu a nwụrụ ka ha kasie obi.

O kwuru na ọchịchị ya ga-enye ndi mmadu ohere okpukperechi ọ bụla ọ chọrọ ma chekwaa ebe okpukperechi di iche iche. O gwara ndi ọrụ ha bụ ichekwa obodo ka ha bido nyocha ma kpọpụta ndi a mere ihe a.

Leave a Reply