FeaturedSports

Buhari emee Amokachi SSA n’ihe gbasara Egwuregwu

Views

Onyeisiala Naịjiria emeela onye gbaabụrụ ‘Super Eagles’ nke Naịjiria bọọlụ bụ Daniel Amokachi onye ndụmọdụ n’ihe gbasara Egwuregwu na Naịjiria(SSA on Sports).

E mere ka a mara nke a n’akwụkwọ ozị John Akanji bụ onye ndụmọdụ Minista na-ahụ maka ndị ntorobịa na egwuregwu, Sunday Dare.

E nyere Amokachie akwụkwọ ọrụ n’Ọgọọstụ 17, 2020 nke ode akwụkwọ Naịjiria bụ Boss Mustapha binyere aka.

Leave a Reply