Igbo News

Buhari ekwesighi ịgụpụ ndi bi na ọwụwa anyanwụ na nhọrọ o mere: Shehu Sani

Views

Shehu Sani bụ onye nnochianya Kaduna Central nke ụlọ omeiwu agwaala Buhari ka ọ ghara ịgụpụ akụkụ Naijiria ụfọdụ maka na ha atụnyeghiri ndi All Progressive Congress na ntụli aka gara aga.

Shehu kwuru na ụdị agwa ga-eme ka nsogbu nkewa nke obodo bawanye karia. O kwuru nke a na nkuzi nke o nyere ndi nta akụkọ na Niger Steeti nke isiokwu ya bụ ‘Niger Open Forum’.

O kwuru ihe ndi a:

‘A atụrụ anya na Buhari merie, mmeri ya bụ maka onye ị bụla. Ọ bụ ihe jọkariri udele ma sigbuo nkapi ma Buhari kewapụ ụfọdụ mmadu n’ihi agbụrụ ha ma ọ bụ okpukperechi ha n’ ihe gbasara ọchịchị nke obodo a. Ka emechara ntụli aka, o kwesiri ịchịkọta obodo niile ọnụ’.

O kwukwara ka Buhari jiri ugbu a họpụta ndi ha na ya ga-arụ ọrụ nke ndi bekee na-akpọ ‘Cabinet members’ ka ebido ọrụ ozigbo.

Leave a Reply