Igbo News

Buhari egosi Mwute ya na Mbugharị e mere Ntuliaka

Views

Onyeisiala Muhammadu Buhari egosipụtala obi mwute nakwa obi mgbawa ebe ndị INEC nọ maka mbugharị ha bugharịrị ntuliaka maka nhọpụta onyeisiala.

N’okwu nke ya, ọ sịrị; ‘ọ bụ ezigbo ihe mwute na INEC bugharịrị ụbọchị ntuliaka maka nhọpụta onyeisiala nakwa ndị omebe iwu n’agbanyeghi ogologo oge nakwa ezi nkwado e nyere ha. Ọ kacha ewute m na ha zipụrụ ozi a naani ihe fọdụrụ awa ole na ole ka erie ihe a na-amụrụ anya kemgbe’.

Ọ gara n’ihu rịọ ụmụafọ Naijiria ka onye ọ bụla dere duu ma ghara ịda mba n’ ịpụta na Febuarị 23, 2019 ka a tụọ akwụkwọ maka nhoputa onyeisiala dịka o siri kwesi ekwesi.

Ọ gara n’ihu dọọ ndị INEC aka na ntị ka ha gbaa mbọ hụ na ngwa e ji eme ntuliaka nọ n’ezi nchekwa.

Leave a Reply