FeaturedIgbo News

Buhari egbochiela ndị Ministas na ndịisi ụlọọrụ ịga obodo ndị ọzọ

Views

 Onyeisi ala Muhammadu Buhari na Fraide gbochiri ndị minista niile na ndị isi ụlọọrụ niile nke gọọmentị etiti nwe ịhapụ obodo a ruo mgbe emechara ihe niile gbasara mmefu ego nke afọ 2020.

N’okwu nke Mz. Willie Bassey, onye ntụziaka ozi nke onye odee akwụkwọ nke gọọmentị etiti, kwuru na nke a amalitela ozigbo.

O kwuru na mgbochi a ga-eme ndi minista na ndịisi ọrụ tinyekọta aka ọnụ ịhụ na usoro mmefu ego gara ọfụma ma gakwa n’oge.

Leave a Reply