FeaturedIgbo News

Buhari, Conde enye ndi na-efe ala nna ihe onyinye Sallah

Views

Dịka aka na-eme emume Eid-el-Kabir, Onyeisi ala Muhammadu Buhari na onye otu ya si Guinea bịa leta ya, nke a na-akpo Alpha Conde, nyere ndi ntorobia na-efe ala nna ha osikapa, ego na ehi na Katsina Steeti.

Ndi ntorobia a gara nleta na be onyeisi ala na Dausa, Katsina na Sọnde, ebe o na-eme emume Sallah, ya na Conde.

Ebe Buhari nyere ndi ntorobia ehi abụọ, akpa osikapa iri, na ego, onye ọbịa ya nyere ha ehi abụọ.

Onyeisi ala ji ohere a gbaa ndi ‘Corper’ ndi a ume. O gwara ha ka ha na-ebi ndu dịka nna nna ha ndi wepụtara atụmatụ NYSC siri chee. O kwuru na NYSC bụ ụzọ eji ewekọta ndi Naijiria ọnụ, ya mere, ebe ọ bụla ha nọ, ha kwesiri I na-egosi ezigbo agwa nke ga-ebute udo n’obodo ahụ.

Leave a Reply