FeaturedIgbo News

Buhari agbatia oge ọrụ onyeisi ụlọọrụ Nigeria Prison Service

Views

Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari agbatiala oge ọrụ Ja’afaru Ahmed, onyeisi ụlọọrụ Nigeria Prison Service ma tụkwasị ya otu afọ.

Georgina Ehuriah, onye ode akwụkwọ Ministry of Interior kwuru nke a ma kwee onyeisi ụlọọrụ NPS n’aka n’ihi ihe ọhụrụ nke ọ na-eme n’ụlọọrụ ahụ.

Oge ọrụ Ja’afaru kwesiri ịkwụsi n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julai, n’afọ 2019. Ihe mere e jiri gbatia oge ọrụ ya bụ ka o nwee ike ikwanye aja n’ukwu ọrụ ọhụrụ nke ụlọọrụ a wepụtara dika, ‘Human right compliance, Reformation and Healthcare, Agricultural and educational programmes for inmates’.

Leave a Reply