Igbo News

Boko haram egbuo ndi agha ma mebie ọtụtụ ihe

Views

Ihe ruru ndi agha

ise anwụọla n’ọgụ ha na ndi Boko haram lụrụ na Monguno, Borno Steeti. Ọgụ a bụ nke a lụrụ n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun, 2019 mgbe ọ kụrụ elekere isii nke abalị.

Ndi nta akụkọ kwuru na Boko Haram ji ihe ruru ụgbọala iri atọ na ngwa agha dị iche iche wee bịa ọgụ a. Tụpụ ndi agha a mara ihe na-eme, ha eburula ngwa agha Naijiria laa.

Ọtụtụ ndi agha bụ ndi merụrụ ahụ, ma mmadu ise n’ime ha bụ ndi a sị nwụrụ ozigbo. Ndi nwakpo a zukwara ihe oriri na ụgbọala ụlọ ọgwụ ndi agha Naijiria.

Leave a Reply