FeaturedGossipsLifestyle

Bobrisky bụ ihe ihere nyere Naịjirịa: Runsewe

Views

Gọọmentị etiti ekwuola na a ga-eyi Okuneye Idris Olarenwaju egwu. Nwokorobịa a maara dịka Bobrisky bụ onye na-eyi akwa ma na-akpa agwa dịka nwaanyị.

Onyeisi National Council for Arts and Culture, Otunba Runsewe Olusegun gwara ndị Vanguard nke a, mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ.

O kwuru na ‘Bobrisky bụ ihe ihere nyere obodo a. O bidoro site n’ire ude na-acha mmadụ ọcha, ma ugbu a, o nweela ara na ukwu dịka nwaanyị’.

‘Ọ bụrụ na Bobrisky na-eme ọfụma n’agbanyeghi ndụ ọjọọ ọ na-ebi, kedu otu a ga-esi agwa ndị ntorobịa Naịjirịa ka ha ghara ime otu a? Bobrisky nwere ike ibi ụdị ndụ a, mana ọ bụghị na Naijiria’.

O kwuru na ọ bụrụ na emeghi ihe ọ bụla ugbu a, a ga-enwe ọtụtụ mmadụ ndị ga-eme ka ya n’ọdịnihu.

O kwuru na ọrụ ya gụnyere ikpuchite omenaala obodo a, ya mere ọ gaghị adị mma ma a gba nkiti.

Leave a Reply