FeaturedIgbo News

Bishop egosila mwute maka ogbugbu ụkọchukwu na Taraba

Views

Bishọpụ nke Katọlik Dayasi nke Jalingo, Bishọpụ Charles Hammawa, na Tọzde, gosiri mwute ya maka ogbugbu Rev.Fr. David Tanko nke St. Peter’s Catholic Parish Amadu, Taraba.

Ndi Daily Post kpesara na otu ndi omekome, a na-amaghị ndi ha bụ, na Tọzde wakporo ma gbuo Rev. Fr. David Tanko. Ha gburu ụkọchukwu ma mụnye ahụ ya na ụgbọala ya ọkụ.

Dịka ndi News Agency of Nigeria siri kwuo, Hammawa, n’ajụjụ ọnụ a gbara ya kwuru na ụdị ogbugbu bụ nke na-eyi egwu.

Bishọpụ kwuru na e gburu Fr. Tanko n’ụzọ di n’etiti Kasuan Haske na Tortsee, mgbe ọ na-aga Amadu.

O kwuru; ‘anyị nọ n’iru uju maka ihe a merenụ. Kemgbe ka anyị na-agbasa oziọma maka udo; ma na-agba mbo ịhụ na inyere ndi nọ na nsogbu aka. Mana igbu ụkọchukwu n’ụzọ dị otu a bụ ihe mgbawa obi’.

‘Ka ọ dị ugbu a. o nwebeghi ndi a na-atụ aka na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi’.

Bishọpụ gwara NAN ns ndi uwe ojii ebidola inyocha ya bụ okwu ma na-ekpe ka ejide ndi a ka ngwere bịara ha ụgwọ n’ihi na ha akpaala nku ahụhụ.

O kwuru na ha na-akwado inye ụkọchukwu a olili kwesirinu.

Leave a Reply