FeaturedIgbo News

Bill Gates gbanwere ndụ m – Aliko Dangote

Views

Onye azụmahịa, Alhaji Aliko Dangote, kwuru na ọ na-atụ anya inye ndi mmadụ ego ruru ijeri naria itolu na nde abụọ (#9.2 bn) dịka Bill Gates.

Dangote, onye so ndi kacha baa ọgaranya n’Afrika kwuru nke a na 2019 Goalkeepers’ event nke ‘Bill Gates na Melinda Gates Foundation’ kwadoro na New York na Wenesde.

Dangote, mgbe ya na Gates na-akpa nkata, kwuru na obi dị ya ụtọ gbasara otu Bill Gates si emesapụ aka. O kwuru na otu Bill Gates si eleta ma na-egosi ndi Afrika ọkachasị Nigeria ịhụnanya na-enye ya obi aṅụrị.

Dangote kwuru na omume Gates gbanwere ya ebe ọ dị ukwuu. O kwuru na ọ maghị na Bill bụ onye dị umeala ruo mgbe ọ hụrụ. Otu a ka o kwuru:

‘Ọ ga-ara ahụ ịchọta onye dịka Bill Gates n’ụwa a. Bill, anyị na-ekele gi maka ọrụọma gi. M na-ekwe gi nkwa na n’afọ ole na ole na-abịanụ, m ga-enye ndi mmadu ego n’efu maka ọdịmma obodo a’.

N’aka nke ọzọ, Bill Gates kelere Dangote otu o siri jikọọ ya na gọvanọ ndi ugwu. O kwuru na site n’aka Dangote na ya na gọvanọ isii ndi si na steeti ndi dị n’ugwu lebara anya n’ihe gbasara ọgwụ mgbochi.

Gates kwuru na ibi na America na Europe pụtara ogologo ndu mana Africa na Asia adịghị otu a. Ya mere ọ na-agba mbọ ịhụ n’Africa nwetara ezi ebimndu ọ kachasị n’agụmakwụkwọ na n’ahụike.

Leave a Reply