FeaturedIgbo News

Biafra: Ọhanaeze Ndigbo egosila mwute maka ọnwụ nne Nnamdi Kanu

Views

Ọhanaeze Ndigbo egosila ọmịiko maka ọnwụ nne onyeisi Indigenous Peoples of Biafra (IPOB), Nnamdi Kanu.

Ndị Daily Post kwuru na nne Nnandi Kanu, Ugoeze Sally Meme Kanu nwụrụ n’ụtụtụ Sọnde.

Ọhanaeze Ndigbo zigara ozi a site n’akwụkwọ ozi nke a Onyeisi Ọhanaeze, Chief Nnia Nwodo, nke kwuru, ‘Ndigbo na-ezigara gị na ezinaụlọ gi ozi ọmịiko maka ọnwụ nne gi, Odoziakụ Ugoeze Sally Kanu’.

‘Anyị na-agba gi ume ma na-akasi gi obi n’okwu Chukwu, nke na-enye ndị kwere na ya nkasi obi. Ka mkpuru obi ya zuo ike na ndọkwa’.

Leave a Reply