Igbo News

Biafra: Ndi bi na mba ụwa apụta n’igwe ikwado Nnamdi Kanu

Views

Onyeisi ndi Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Mazi Nnamdi Kanu ka nọ n’ije na mba ofesi iji nweta nkwado maka ịtọhapụ ndi Biafra.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ide akwụkwọ nke IPOB bụ Emma Powerful kwụputara nke a n’ụbọchị Tuzde n’Ọka. O kwuru na ndi Biafra bi na USA egosila onye ọ bụla na ha kwadoro nnwere onwe nke Biafra. O kwukwara na ọtụtụ ezinaụlọ na otu di iche iche na-anabata onyeisi ha n’ụdị pụrụ iche.

Emma mekwara ka a mara na ebe ọzọ Nnamdi ga-aga bụ Houston Texas n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun, 2019. Ma ndi bụ Biafra ma ndi na-abughị ga-agbakọ were nụ oziọma nnwere onwe na ntọhapụ nke Biafra.

Leave a Reply