FeaturedIgbo News

Biafra: Ihe ga-eme ma ndi Igbo wepụtara onyeisi ala na 2020 – BNYL

Views

Biafra Nations Youth League, BNYL, na Tuzde, kwuputara na ha ga-agba mbọ inweta Biafra, ma ndị Igbo ewepụtara onyeisi ala ma ha ewepụtaghị.

BNYL kwuru na ndi mpaghara ọwụwa anyanwu atala ahụhụ nke ukwu maka Biafra. Ya mere, ha agaghị ahapụ Biafra maka onyeisi Naijiria 2023.

Onye mere nkwuputa bụ onye ode akwụkwọ ha, Ordu Jeoffery Nwosoiba. O kwuru na ha anaghị egbochi onye Igbo ịbụ onyeisi ala, kama na ọnọdụ onyeisi ala agaghị eme ka emechie okwu Biafra.

Nwosoiba kwuru na ndi mpaghara ndịda ugwu: Bayelsa, Akwa Ibom. Rivers, na- akwado ha. O kwuru na ọ ga-ara ahụ ịhapụ Biafra nke bụ oke ha.

Leave a Reply