EntertainmentFeatured

BBNaija: Mercy abụrụla nwanyị mbu meriri na emume BBN

Views

Nwagbọghọbịa afọ iri abụọ na isii, Mercy Eke, onye ndi mmadu na-akpọ ‘Mercy Lambo’, abụrụla onye mmeri na BBNaija nke 2019, nke bịara n’isi njedebe na Sọnde, ka abalị iri itolu na itolu gasiri.

Mercy nwetara parcenti 41.77 nke mere o jiri merie ndị ha na ya na-azọ ego na ihe onyinye ruru nde naira iri isii. Ndị a gunyere:  Mike, Frodd, Omashola na Seyi. Ndị a bụ ndi ruru agba nke ikpeazu.

Ihe nkiri BBNaija nke afọ bụ nke nabatara mmadu iri na otu, tinyekwara mmadu ise ndị a nabatara mgbe emume a gara ọkara.

Maka mmeri a, enyere Mercy nde naira iri atọ. Ọ ga-anatakwa ihe onyinye ndi ọzọ, nke rukwara nde naira iri atọ

Leave a Reply