EntertainmentFeatured

BBNaija 2019 ga-ebido n’elekere asaa uhuruchi (7pm) ụbọchi ụka

Views

Big Brother Naija nke ndi mmadu na-atụ anya ya kemgbe na-ebido tata bụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Juun. Emume a na-eme n’ihe onyonyo bụ nke na-eme ndi mmadu obi ụtọ. Ndi ga-esonye n’ ihe egwuregwu ga-azọ ego ruru nde naira iri isii (60m) n’agba nke anọ a. Ndi na-akwado agba nke afọ a bụ ndi Bet9ja.

Ebumnobi emume a bụ ka ndi mmadu nwee obi ụtọ site na mgbe ọ ga-ebido ruo mgbe ọ kwụsịrị. Emume a bụ nke ga-emegide ruo izu iri na abụọ. Ndi ga-ebido emume nke agba ga-eso iwu ndi edeputara maka emume a. Iwu ndi gunyere:

Ha ga-akwanyere ụlọ ha ga-anọ ugwu ma kwakwara ndi ha na ha so azọ ego a.

A gaghị enwe mmekọrịta ọ bụla n’etiti ha na ndi na-esoghi n’emume.

Ha agaghị alụ ọgụ ma ọ bụ merụọ mmadu ahụ; a ga-achụpụ onye mere otu a.

Ihe niile ha ga-eme bụ ihe a ga-egosi n’ihe onyonyo, ya mere ha ekwesighi imechi ọnụ ma ọ bụ kwuo ihe mmadu agaghị anụ.

Ihe ndi a na ndi ọzọ bụ iwu enwe gasiri.

Emume a ga-ebido n’elekere asaa nke abalị. Ọ bụkwa Ebuka Uchendu ga-amalite emume a.

Leave a Reply