FeaturedGossips

BBN: Ihe di woro ogori azụọla n’ahia

Views

Otu nwaada Yoruba a na-akpọ Khafilat Kareem, onye so na-emume nkiri BBNaija, ka ekwuru na a ga-achụ n’ọrụ na ụlọ ọrụ ndi uwe ojii, Met nke Britain maka na o nwere mmekọahụ na BBN. Khafi tụpụ o sonye n’ihe nkiri BBN nke afọ a bụ onye uwe ojii na Britain.

Nyocha e mere gosiri na ndiisi ndi uwe ojii ebe ọ na-arụ ọrụ ekweghi ya sonye na BBN nke afọ, mana Khafi kachiri nti, hapụ ọrụ ma sonye na ya bụ emume.

Ihe bụ isiokwu ugbu a bụ na Nwada na-enwe mmekọahụ; ya na onye otu ya a na-akpọ Ekpeta Gedoni. Ọtụtụ igwe mgbasaozi eburula ya bụ ozi fesasia ebe niile. N’ozi a ha na-agbasa, ụfọdụ tinyere na o nwere ike ịdị ime tụpụ a na-emecha BBN nke afọ.

Ndi uwe ojii Met hụrụ ozi a nke mere ha jiri kwuo na-aga achụ ya n’ọrụ n’ihi na ụdị agwa ọ na-akpa na-ebutere ha ihe ihere.

Leave a Reply