FeaturedIgbo News

Atiku na otu ndị ọzọ ekwuola na iwu ‘Hate Speech’ siri ike omume

Views

Ndị omeiwu ewepụtala iwu nke na-achọ ikepụta ụlọọrụ gọọmentị etiti nke na-ahụ maka okwu na-ebute esemokwu n’obodo a.

Iwu a kwuru na a ga-egbu onye dara iwu site n’ịkwụgbu n’osisi. Iwu a megidere onye ọ bụla dere, kwuru, mepụtara ihe ọ bụla ga-ebute iwe, ekworo na esemokwu n’obodo a. E kwuru na onye dị otu a ga-aga nga ebighi ebi, ma ọ bụ egbuo onye ahụ site n’ịkwụgbu ya na ihe ndị ọzọ.

N’ihi nke a, ọtụtụ ndị mmadu apụtala ịkatọ iwu a. Onye nchịkọta Free Nigeria Movement, Mz Raphael Adebayo, kwuru na otu ya ga-achịkọta ndị mmadu, ndị ga-eme ngagharị iwe maka iwu a. o kwuru na iwu a ga-anara ndị mmadu oke ruru ha.

Ọzọkwa, Atiku Abubakar na Tuzde, kwuru na iwu na-enupuisi n’oke ndị Naijiria, nke kwuru na onye ọ bụla nwere ikike nkwuwa okwu.

Ndị Nigeria Bar Association ekwuola na iwu adabanyeghi n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

Senior Advocate of Nigeria, Ifedayo Adedipe, katọrọ iwu a ma gwa ndị Naijria ka ha jụ iwu a nke na-akparị ndị Naijiria,

 

Leave a Reply