EntertainmentUncategorized

Asọmpi bọọlụ Mbaụwa Ụmụnwaanyi 2019: Chiamaka egosila nke o ji kara ibe

Views

Nwaada Chiamaka Nnaedozie bụ onye na-echere otu Super Falcon Naijiria bọọlụ egosila nke o jiri kara ibe ya na nsọmpi iko mba ụwa nke ụmụnwanyị.

Nwaada bụ onye atụnyere ugo dịka nwanyị mbu a na-asabeghị goolu na nsọpi iko mba ụwa nke ụmụnwanyị.

Chiamaka dị afọ iri na asatọ mgbo o bidoro ịgbara otu egwuregwu Rivers Angels bọọlụ n’afọ 2016. N’afọ 2018, o chere otu Super Falcons bọọlụ na nsọmpi iko mba ụwa nke ụmụnwanyị ebe ọ nọ nweta ntụrụ ugo ‘Dare to shine’ maka ime nke ọma na nsọmpi na mba Haiti.