FeaturedIgbo News

Asambodo onyeisi ala bụ adigboroja

Views

Ụlọ ikpe mkpesa nke Abuja n’ụbọchị Mọnde enyela Buhari ụbọchị ise iji zaghachi ha maka mkpesa nke e nyere. Mkpesa bụ na Buhari etorughi ọkwa onyeisi ala n’ihi na asambodo ya bụ adigboroja. Ụlọ ikpe nyere ndi otu All Progressive Party na ụlọ ọrụ INEC ụbọchị ise.

Onyeisi ọka ikpe, Justice Yayaya onye nyere iwu a gwara ndi ọkaiwu nke onyeisi ala ka ha mee ihe kwesịrị omume n’oge enyere ha.

Ndi mere mkpesa bụ Agu Kalu, Labaran Ismail na Hassay El-Kuris. Dika ekpere n’ikpe, ha kwupụtara na akwụkwo nke onyeisi ala wepụtara na asambodo ndi o weputara maka ntụliaka 2019 bụ adigoroja; ma kwuo ka ewepụ ya n’ọkwa ya.

Ụlọ ikpe ga-ezukọ ọzọ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Julai maka nchịkọta ikpe a.

Leave a Reply