FeaturedIgbo News

Ọchịchị ndị APC agaghị akwụsị na 2023 : Oshiomhole

Views

Onyeisi oche ndi All Progressive Congress, Adams Oshiomhole, ekwuola na otu APC ga-anọgide n’oche ọchịchị Naijiria ruo 2023 ma gafee.

O kwuru na nke a bụ maka na ndị APC egosila na ọchịchị ha nwere ezi nzube, nke mere ka ha weta obi ndị Naịjirịa.

Oshiomhole kwuru nke a n’Abuja, na Fraịde, na nzukọ nke National Working committee nke ndị gọvanọ ndị a họpụtara site n’otu APC bịara.

Oshiomhole kwuru, ‘Anyị kwetara na otu anyị enweela ọganihu na mpaghara atọ dị mkpa, mana ihe a ga-eme eme ka fọdụrụ ebe ọ dị ukwuu. Site n’ịrụkọta ọrụ ọnụ, o doro m anya na anyị ga-eme ọfụma n’agba nke abụọ a’.

O kwukwara na ha ga-emeri ikpe niile nke ha nwere n’ụlọikpe, n’ihi na aka nkwụmọtọ ka ha ji aga. N’ihi nke a, o kwuru na ha na-echekwube na a ga-enweta ikpe ziri ezi ma bụrụkwa ndị ihu ọma kpọrọ.

Na nzaghachị, Atiku Bagudu nke Kebbi, onyeisi oche Governors Forum, kwuru na ha ga-etinye aka n’ụzọ ha nwere ike iji hụ na otu ha kwụ chịm chịm.

Leave a Reply