FeaturedIgbo News

Anyị na-enye gi ụbọchị iri ato iwepụta ebe obibi maka ndi na-achị ehi: Northern Group

Views

Ndi ntorobia mpaghara ugwu nke Naijiria enyela onyeisi ala Naijiria bụ Buhari ụbọchị iri atọ ka onye iwu ka enye ha ala ka ha mepee ebe obibi maka ndi na-achị ehi na ehi ha; ma ọ bụghị, ha ga-egosi ya ihe ha pụrụ ime.

Abdul-Azeez Suleman, onye nkwuchite ọnụ ha gwara ndi nta akụkọ n’Abuja nke a, ma katọọ osote onyeisi ala bụ Ọkz. Yemi Osibanjo ma kwuo na ọ bụ ya kpatara ihe mere enyebeghi ha ala iji rụọ ebe obibi n’obodo Naijiria niile.

Ndi ntorobia  mpaghara ugwu a nọ n’okpuru otu a na-akpọ Coalition of Northern Group (NG).

Ha kwuru na ọ bụrụ na enyeghi ha ala na steeti niile nke Naijiria, na ha ga-agaghi ekwe ka ndi mmadu nwee udo n’ebe ọ bụla na mpaghara ugwu.

Leave a Reply