FeaturedIgbo News

Anyị ga-egotere ndi kọpa nwere ihe mberede ụkwụ ọzọ: NYSC

Views

Ndi isi ụlọọrụ National Youth Service Corps ekwela nkwa na ha ga-azụtara ndi kọpa nwere ihe mberede okporo ụzọ ụkwụ nke a na-akpọ ‘artificial limb’ na bekee. Ndi kọpa ndi a bụ ndi ụkwụ gbajiri n’ihi ihe mberede okporo ụzọ nke mere mgbe ha si kampụ apụta na Taraba Steeti.

Onyeisi ụlọọrụ NYSC, Shuaibu Ibrahim kwere nkwa a mgbe ọ gara ileta ha n’ụlọ ọgwụ Federal Medical Centre, Jalingo. O kwukwara na ụlọọrụ ya ga-ahụ maka ego niile e jiri nye ndi kọpa ndi a ọgwụ.

O kwuru na ha ga-eme ihe ọ bụla iji nye aka ịgwọ ụmụaka gara ife ala nna ha ọ kachasi I ga Saudi Arabia zụtara ha ụkwụ ọzọ. Ibrahim kwuru na ọ bụ ọrụ gọọmenti ka ụmụaka ndi a bịara, n’ihi nke a, gọọmenti aghaghi inyere ha aka. O kwukwara na a na-elebara ndi ọzọ merụrụ ahụ anya.

Odoziaku Florence Yaakugh bụ onye nlekọta NYSC na Taraba Steeti kelere onyeisi  NYSC maka mbọ ha na-agba.

Leave a Reply