Igbo News

Anyị ga-arụchapụ ọgba egwuregwu steeti tụpụ anyị apụọ n’ọchịchị: Aliyu

Views

Gọọmentị Niger Steeti ekwuola na ha ga-arụpụcha ọgba egwuregwu nke ebidogori n’oge gara aga, ebe etinyerela ego ruru ijeri naira abụọ na nde anọ (2.4b). Ọgba egwuregwu a bụ nke dị na Markunkele na Niger Steeti nke gọọmentị chịburu bidoro n’afọ 2015 ma hapụ ya na-arụchaghị ya.

Alhaji Aliyu Adama gwara ndi News Agency of Nigeria na Minna na tụpụ ha apụọ n’ọchịchị n’afọ 2023, na ha ga-arụchapụ ya bụ ọgba egwuregwu. Aliyu bụ onyeisi egwuruegwu bọlụ nke Niger State a na-akpọ ‘Niger Tonadoes’, kwuru na ọ dị mkpa ịrụpụcha ọgba egwuregwu a ma mee ya ihe eji ama aka n’obodo ndi ọzọ.

Alhaji Baba Sheshi bụ onyeisi ụlọ ọrụ Ministry of Sports Development nke Niger Steeti kwuru na ọgba egwuregwu a ga-aba mmadu puku iri na ise (15,000). O kwuru na ụlọ ọrụ ji ọrụ bụ Sun way steel building company nke ụlọ ọrụ ha dị n’Abuja.

Leave a Reply