Igbo News

Anyị ga-akpọpụ ụmụ anyị na Madonna: Nne na nna ụmụakwụkwọ

Views

Ihe ruru nne na nna ruru narị abụọ kwuputara na ha ga-akpọpụ ụmụ ha na Mahadum Madonna ma ọ bụrụ na ha ahapụghị ụmụakwụkwọ isii na otu onye nkuzi ha nwụchiri. Nke a bụ tupu a hapụ ụmụakwụkwọ ndi a n’ehihie taa bụ abali nke anọ n’ọnwa Julai. A nwụchiri ụmụakwụkwọ ndi a na otu onye nkuzi n’ọnwa Febuari maka ha kwuputara ihe ọjọọ na-eme na ya bụ ụlọakwụkwọ.

Ihe ụmụakwụkwọ ndi a kwuru bụ na otu esi elekọta ha n’ụlọakwụkwọ adịghị mma. Nke a mere ụlọakwụkwọ jiri nwụchie ha.

N’ụbọchị Tuzde ka e kwesiri ikpe ha ikpe ma ahụghị Justice Babatunde Qvadiri onye kwesiri ikpe ha ikpe na Federal Court nke dị n’Ọka, Anambra Steeti.

Ụlọ ikpe juru n’ọnụ ebe nne na nna ụmụakwụkwọ ndi a na ndi agbataobi ha biara imara otu ihe ga-esi aga, mana onye omeiwu abịaghi.

Ụdị agwa a mere nna na nne ndi ọzọ jiri kwuo na ha ga-akpọrọ ụmụ ma ọ bụrụ na ha akpọpụtaghị ndi ha ji.

Leave a Reply