Igbo News

Anyị ga-achụ ndi nkuzi aha ha na-adighị n’akwụkwọ anyị: Segun Ajiboye

Views

Ụlọ ọrụ Teachers Registration Council of Nigeria (TRCN) ekwuputala site n’ọnụ Okz. Segun Ajiboye na ọnwa Decemba ga-abụ oge ikpeazụ a ga-enwe ndi nkuzi na-etorughi ikuzi nkuzi n’obodo a.

Ajiboye gwara ndi nta akụkọ n’Ibadan na ụlọ ọrụ National Council of Education enyela iwu ka ndi nkuzi niile ga denye aha ha n’akwụkwọ tụpụ ọnwa Decemba eruo, ma nata asambodo n’aka TRCN.

Ajiboye kwuru na obodo Naịjiria chọrọ ndi nkuzi tozuru etozu ikuziri ụmụ akwụkwọ. TRCN chọrọ ịchụpụ ndi nkuzi adigboroja niile n’ụlọ akwụkwọ ka ụmụ akwụkwọ bụrụ ndi azụrụ nke ọma.

O kwukwara na oge ka dị maka ndi nkuzi na-edebeghi aha ha n’akwụkwọ nke TRCN. Ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Decemba ka ha ga-emechi akwụkwọ.

 

Leave a Reply