FeaturedIgbo News

Anyị enweghi atụmatụ ibuli egoọnụ mmanụ ọkụ: NNPC

Views

Ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ ala na Naijiria bụ National Petroleum Company (NNPC) agwala ọhanaeze na ọ bụghị ebumnobi ha ibuli egoọnụ mmanụ ọkụ; ma kwuo na ọ bụ ndi ọchọnganoko nyụrụ ihe na-esinụ.

Ndu Ughamadu, onye na-ahụ maka ọhanaeze n’ụlọ ọrụ NNPC kwuru nke a n’ụbọchị Wenesde mgbe ọ gara hụ onyeisi ndi omeiwu bụ Ahmed Lawan. O kwuru na ọ bụghị ihe dị mfe ime ka ego ọnụ mmanụ ọkụ bụrụ otu nari naira na iri anọ na ise (#145).

O kwuru na NNPC enweghi ike ibuli ma ọ bụ wetuo ego ọnụ mmanụ ọkụ ma kwuo na mmanụ ọkụ dị ọnụ ala na Naijiria ma ọ bụrụ na-atụnyere ya obodo ndi ọzọ n’Africa.

Ọ dụrụ ndi na-ere mmanụ ọkụ ọdụ ka ha hapụ irefe ego ọnụ mmanụ ọkụ ma gwa ohanaeze ka ha kwuputa ndi na-ere mmanụ ọkụ karia ego ọnụ e kwuru.

Leave a Reply