Igbo News

Anyi achụpụghị ndi na-achị ehi: Ndi Enugwu

Views

Ndi Agbada Nenwe dị n’Aninri LGA n’Enugwu Steeti, ndi Hausa/Fulani nakwa ndi Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) nọ n’ọwụwa anyanwụ ekwuola na ha achụghị ndi na-achị ehi n’obodo ha. Ihe butere okwu a bụ ihe onyonyo a hụrụ n’igwe social media nke kwuru na-achụpụrụ ndi na-achị ehi.

Ndi uwe ojii nke Enugwu Steeti mgbe ha nụrụ akụkọ na social media kwuru na ụdị ihe a emeghi. Nchọcha ha mere gosiri na ihe mere bụ na ndi na-achị ehi siri n’obodo ha gafee ebe ha na-achọ nri ehi.

Ụbọchi Mọnde ka Gọvanọ Ugwuanyi Ifeanyi nke Enugwu Steeti, Kọmishọna nke ndi uwe ojii, onye ntụziaka Department of State Service (DSS), Civil Defence Corps na ndi ọzọ gara Agbada Nenwe ka a mara ka eke si anya anwụ.

Onyeisi ndi Agbada Nenwe kwuru na ha ndi na-achị ehi enweghi nsogbu ọ bụla nakwa na-enwebeghi mgbe egburu ehi ọ bụla. O kwuru na ha na-ebi n’udo dika Gọvanọ Ugwuanyi siri gwa ha.

N’aka nke ọzọ, Ugwuanyi gwara ndi Enugu na o nweghi ihe na-eme n’Enugu; ya mere na Enugwu bụ otu n’ime steeti e nwere udo.

Leave a Reply