Igbo News

Anyị achọghị mahadum ọhụrụ na Naijiria: JAMB

Views

Ụlọ ọrụ Joint Admission and Matriculation Board (JAMB) ekwuola ka ahapụ ịrụ ma ọ bụ mepee mahadum ọhụrụ ọzọ na Naijiria.

Mazi Is-haq Oleyede kwuru na e kwesiri ileba anya na mahadum ndi enwegasiri karia imepe ndi ọzọ. O kwuru na e nwere mahadum iri anọ na atọ (43) nke federal ma nwee mahadum iri anọ na asatọ (48) nke steeti, ebe mahadum nke onwe di iri asaa na itolu (79).

O kwukwara na agụmakwụkwọ bụ ihe kwesiri ka onye ọ bụla tinye aka kwalite; ọ bụghị ihe a na-eme iji kwalite ọchịchị. Ya mere, gọọmenti kwesiri itinye ego n’agụmakwụkwọ nke obodo Naijiria.

Abubakar Rasheed bụ onye ode akwụkwọ ụlọ ọrụ National Universities Commission (NUC) kwuru na ụlọ ọrụ ha na-eleba anya na leta gbasara inye ikikere imepe mahadum nke onwe ruru narị atọ na atọ (303).

Ndi ụlọ ọrụ JAMB kwuru ka a ghara ịkwado mmepe mahadum nke onwe n’ihi na ha na-ebute nsogbu n’agụmakwụkwọ nke Naijiria.

Leave a Reply