FeaturedIgbo News

Anwụchiela nwoke tufuru nwa ya n’ime osimiri

Views

Ndị Nigeria Security and Civil Defence Corp (NSCDC) na Tuzde, jidere onye na-agba ọgbatumtum dị afọ iri abụọ, Mustapha Aliyu, onye tufuru nwa ya dị ọnwa anọ n’ime mmiri.

Onyeisi ndị corps, Mz. George Edem, gwara ndị NAN na-ejidere nwoke a na Tamanine nke dị na Borgu LGA, Niger State.

O kwuru na achọtabeghị ozu nwa ahụ nakwa na-etinyela nwoke ahụ n’aka ndị uwe ojii maka nnyocha.

Aliyu gwara ndị nta akụkọ na o tufuru nwa ahụ n’ihi na nne ya na nne enyi ya nwanyị, onye mụrụ ya nwa ahụ, ahụghị nwa ahụ n’anya.

O kwuru na anya na-enwu nne ya ọkụ mgbe ọ bụla kwutere okwu nwa ahụ. Nne ya na-ekwukwa na ọ ga-abụ nwa ahụ ọnụ mgbe ọ bụla ọ kpọlatara nwa ahụ n’ụlọ ha.

N’otu aka ahụ, Aliyu kwukwara na enyi ya nwanyị na-ebe akwa oge ọ bụla maka ụdị okwu nne ya na-agwa maka nwa ahụ.

O kwuru na ọ dị njikere ime ihe ọ bụla so agwa ọjọọ ọ kpara n’azụ.

Leave a Reply