FeaturedIgbo News

Anwụchiela ndị arịrịọ iri abụọ na asaa na Kano

Views

Ndị Kano State Hisbah Board na Tọzde, nwụchiri ndị arịrịọ iri abụọ na asaa na Kano maka ịda iwu nke machiri ha ịrịọ arịrịọ na Steeeti.

Malam Lawan Ibrahim, onye otu a na-ahụ maka ọha, kwuru nke a n’ajụjụọnụ ya na ndi News Agency of Nigeria (NAN) nwere na Kano.

Ibrahim kwuru na ha bidoro nwụchi a na elekere iri na abụọ nke ụtụtụ ruo elekere abụọ nke ehihie na Kano Guest Inn, Sabon Gari, Triumph na Railway.

O kwuru na ụmụaka ndi a anwụchiri gunyere ụmụnwoke iri na asatọ na ụmụnwanyị itolu, ndi dị site afọ iri na atọ ruo afọ iri na itolu.

O kwuru na mgbe enyochara ụmụaka a, achọpụtara na nke a bụ mbu ha na-eme ihe dị ọtu a. Ha kpọrọ nne na nna ha ma nyefee ha ụmụaka ndi a ma dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịkpa agwa ọjọọ a ọzọ.

O kwukwara na ha ga-anwụchi ndi arịrịọ ndi na-achọghị iso iwu nke machiri ịrịọ arịrịọ na Steeti. O kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na-akwụsịrị arịrịọ kpam kpam na Kano Steeti.

 

Leave a Reply