FeaturedIgbo News

Anambra na Rivers enwela kọmishọna ndi uwe ojii ọhụrụ

Views

Ụlọọrụ Uweojii Naijiria atụghariala ndi kọmishọna uweojii nke Anambra na Rivers Steeti. Abang John onye nọbụ na ngalaba Nchọcha na Nhazi, n’isi Ụlọọrụ nke dị n’Abuja bụ onye ezigara Anambra Steeti, ebe kọmishọna nọbụ Anambra bụ Dan Daura Mustapha ka ezigara Rivers Steeti.

Kọmishọna ndi uwe ojii nke Rivers Steeti bụ Usman Alhassan Belel bụ onye enyere iwu ka ọ laghachi n’isi Ụlọọrụ nke dị n’Abuja, ebe ọ ga-enwe ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka ngalaba Nchọcha na Nhazi.

Onyeisi ndi uwe ojii na Naijiria adụọla ndi kọmishọna a ọdụ ka were amamihe na akọ na uche ha tinye n’ọrụ n’ebe ọhụrụ a ezipụrụ ha.

Leave a Reply