Igbo News

Anaghi m enyere ndi na-achị ehi aka imepụta Ruga settlement: Osibanjo

Views

Onye na-esote onyeisiala Naijiria bụ Ọkz Yemi Osibanjo enyela akụkọ nke gọnahụrụ na ọ naghị enyere ndi na-achị ehi aka maka mmepụta Ruga settlement na Naijiria.

Ndi Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) kwuru na ọfiisi nke onye na-esote onyeisi ala na-enyere ha aka imepụta Ruga settlement.

Yemi Osibanjo kwuru na atụmatụ nke o na-ahụ maka ya bụ National Livestock Transformation Plan nke ndi gọvanọ steeti kwadoro n’okpuru ntụziaka ndi National Economic Council (NEC) nke Yemi na onwe ya bụ onyeisi oche.

Atụmatụ bụ nke NEC kwadoro n’ụbọchị iri na asaa nke ọnwa January, 2019. Ebumnobi e nwere maka National Livestock Transformation Plan bụ igbanwe otu e si emepụta anụ na Naijiria nke ga-eme ka enwe udo na ikpe ziri ezi.

Steeti ndi sonyere n’atụmatụ a gunyere: Adamawa, Kaduna, Benue, Taraba, Edo, Plateau, Oyo na Zamfara.

Yemi kwukwara na gọọmentị etiti agaghị anara ndi gọọmenti steeti ala n’ike.

Leave a Reply