FeaturedIgbo News

Amaala onye na-efe ala nna ya ikpe maka wayo ịntanetị

Views

Ndị EFCC nke dị n’Enugu, na Mọnde, mara Samuel Orie, nwata nwoke na-efe ala nna ya ikpe, n’ihu Onye ọkaiwu I. N. Buba nke ụlọ ikpe gọọmentị etiti nke dị n’Enugu. Ha kwuru na o zuru ego ruru otu narị dollar na iri ise, site n’igosi onwe dịka onye ọzọ.

Anwụchiri Orie na Ọgọstụ, iri abụọ na atọ, maka wayo. Ọ na-egosi onwe ya dịka Mz. Scott Gibb, onye America na-arụ ọrụ ngo. O ji adresị ozi ịntanetị; [email protected] were na-aghọgbu ndị mmadu.

Onye ọkaikpe Buba mara ya ikpe ma tụọ ya nga otu ọnwa nke bidoro mgbe anwụchiri ya. A nara Orie ego ahụ na ekwentị Tecno Camon M.

Leave a Reply