Igbo News

Ama egwuregwu Abuja enwela aha ọhụrụ

Views

Onyeisi ala Muhammadu Buhari agbanwela aha ama egwuregwu dị n’Abuja. E nyere ebe ahụ aha Moshood Abiola bụ onye meriri na ntụliaka n’afọ 1993. Site ugbu a gawa, aha ebe egwuregwu a ga-abụ MKO Abiola Staduim.

Moshood Abiola bụ onye meriri n’afọ 1993 site na ntụli ndi agụkọrọ ma anapụrụ ya ọchịchị n’ike n’aka onye ọchịchị agha bụ Ibrahim Babangida. Abiola nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ n’oge na-adịghị anya akpọrọ ya ka onyeisi obodo.

Onyeisi ala Naijiria n’afọ 2018 hụtara Abiola dịka onye mere ihe di mkpa ma tunye ya ugo a na-enye ndi isi obodo bụ GCFR. O kwukwara na ụbọchị nke iri na abụọ n’ọnwa Juun ga-abụ ụbọchị emume ọchịchị onye kwuo uche ya n’ihi ọrụ Moshood Abiola rụrụ na Naijiria.

Leave a Reply