FeaturedIgbo News

Ala Mkpoda(Land slide) erie isi ihe karịrị mmadụ 43 na Kerala, India

Views

Ihe karịrị mmadụ 43, na ọtụtụ ndị ọzọ ahụbeghi anya atụnyela isi ha n’oke ala mkpoda (Land Slide) mere na Kerala, India.

Ala mkpoda a zenyere ebe ndị na-arụ ọrụ n’otu ugbo koko bi. Mkamkpa a kpara n’ime abalị Tọọzde ka ndị mmadụ na-arahụ ụra. Ala mpkoda a zeturu ọtụtụ ụlọ, gbuo ma merụkwa ọtụtụ mmdụ ahụ.

Gụọ :Umahi akwado ịrụ Akwa Ngafe ọzọ n’Ebonyi

Dịka CNN siri kọwa, omeiwu Dean Kuriakose mere ka a mata na  ihe kpatara ala mkpoda a bụ oke mmiri ozuzo zoro ụbọchị ahụ. O kwukwara na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ na-abawanye dịka ndị ọrụ enyemaka na-abọpụta ndị mmadụ ala zegidere.

5 Comments

Leave a Reply