Igbo News

Akwụsịla ụkọchukwu katọliki ọrụ maka idine nwaanyi Amerika

Views

Katolik dayosis nke Pittsburgh dị na ‘United States’ akwụsịla ụkọchukwu onye Naijiria, Cyprian Duru ọrụ izi ozi ọma maka idine nwaanyi. Onye boro ya ebubo a bụ Kathy Coll, onye nkuzi asụsụ bekee dị afọ iri isii na asatọ. Amachikwara Cyprian iyi akwa ndi ụkọchukwu ma ọ bụ gosi onwe ya dịka ụkọchukwu.

N’akụkọ Coll, ọ gwara ndi okaiwu na Duru kwụsịrị n’ụlọ ya n’ọnwa Decemba, 2016. O kwuru na Duru mere ka ọ bịara inye ya akwụkwọ ekeresimesi. Ma mgbe ha batara n’ime ụlọ, o jidere ya ma dinee ya. Mkpu niile o tiri akwụsịghị Duru ime ihe ọ chọrọ ime.

Coll kwuru na kemgbe ihe a mere, ihere ekwebeghi ya kọsara onye ọzọ. Ọ gbaliala ime ka ọ mara ma ọ ga-enwete ọgwụgwọ maka ihe a merenu. Ọ buzi mgbe ọ gwara onye ozi ya ka o mere ka dayosis mara ihe mere.

Ka ọ dị ugbu a, ọ na-ahụ dọkịta na-enyere ya aka inweta onwe ya.

Leave a Reply