Igbo News

Akwụkwọ njem nke ịntanetị emeputara ọhụrụ bụ maka onye ọ bụla: NIS

Views

Controller General nke Nigeria Immigration Service, Muhammad Babandede, ekwuola na akwụkwọ njem nke ịntanetị  (e passport) bụ nke anabatara nakwa nke e ji abanye mba ọ bụla.

O kwuru nke a site n’ọnụ Mz. Sunday James, onye ọrụ NIS na-ahụ maka ọha, n’Abuja, na Tọzde.

O kwuru nke a n’ihi nsogbu ndi mmadu nwere maka akwụkwọ njem nke ịntanetị, nke ndi United Arab Emirate (UAE).  O kwukwara na ha emeziela ya bụ nsogbu.

Ọ gwara ndi Naijiria ka ga nweta National Identity Number ma gbaa mbo hụ na nọmba ahụ na nke dị akwụkwọ njem ha bụ otu.

O kwukwara na a ga-enweta akwụkwọ njem ọhụrụ a na Service Headquaters nke dị n’Abuja na n’Ikoyi.

Leave a Reply