Igbo News

Akwụkwọ njem Naijiria buzi eserese ndi ọchị ehi: Gini bụ uche gị na nke a?

Views

Ọtụtụ ndi Naijiria akatọọla onyeisi ala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Ọkz. Yemi Osibanjo maka eserese ndi na-achị ehi esere n’akwụkwọ njem ọhụrụ nke Naijiria.

Akwụkwọ njem ọhụrụ a bụ nke Ụkọchukwu Suleman gosiri ndi mmadu n’igwe social media. Ndi Naijiria hụrụ ihe eserese wee na-akatọ ndi ọchịchị gọọmenti etiti.

Ndi Naijiria kwuru na nke so na atụmatụ ha iji mezuo ọchịchọ obi ha nke bụ ime ka ndi Fulani ọchị ehi gazuo steeti Naijiria niile. N’agbanyeghi nsogbu ndi ọchị ehi na-enye, gọọmenti etiti na-aja ha mma site n’itinye eserese ha n’ihu akwụkwọ njem ọhụrụ. Ndi isi ala anyị na-emezi ka nwata a na-agwọ ibi mana afọ ka na-eto ya. Ya bụ, achụọ ha n’ubi, ha fere ọba.

Leave a Reply