FeaturedIgbo NewsUncategorized

Akwa Ngafe(Fly Over)  Prince Arthur Eze n’ Ebonyi

Views

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi agbaala akwa ngafe ọhụrụ ọ na-arụ n’Ebonyi steeti  a kpọrọ akwa ngafe Prince Artur Eze n’anwu.

 

Dave Umahi ewebatala akwa ngafe dịka ụzọ o si ebelata mkpachi njem okporoụzọ nke ọ bụ ọtụtụ ndị mmadụ na-abata Ebonyi na-ebute.

Ka o siri gbata kwụrụ ugbu a, Ebonyi steeti enweela akwa ngafe anọ ndị gụnyere; Akwa ngafe Sen. Offia Nwali, Akwa Ngafe Akanu Ibiam, Akwa Ngafe st. Margaret Umahi, nakwazi Akwa Ngafe Prince Arthur Eze na-aga n’ihu.

Nwaze Francis, Onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ(New Media) mere ka a mata na DAve Umahi arụọla ọtụtụ ihe n’Ebonyi ma na-etigharị ya bụ steeti mmọnwụ.

N’okwu nke ya , ọ sịrị ‘…Ọzọkwa, enwere ọtụtụ ụzọ ụkwụ na-agafe agafe, àkwà mmiri na ọwara mmiri na steeti ahụ gọvanọ ahụ ejirila aka ha rụọ ụlọ karịa na Water Woks Road, Vanco Junction, New College of Medicine, Ebonyi Hotels junction wdg.

Dị ka ọ dị taa, Ebonyi Steeti kachasị nke steeti ndị nwere netwọ ụzọ kacha mma, nchekwa, mmepe ngwa ngwa n’ihe gbasara akụrụngwa, wdg, nke bụ ihe kpatara steeti a abụrụla nchekwa nke ndị na-etinye ego.’

Umahi, nyochara ọrụ na-aga n’ihu na ya bụ Akwa Ngafe Prince Arthur Eze ụbọchị ụka bụ Septemba 8, 2019.

Leave a Reply