EntertainmentFeatured

Akụkọ Biodun na Busola yiri nkata akpara akpa: Reno

Views

Reno Omokri, onye ode akwụkwọ ama ama nakwa ezigbo enyi onyeisiala Goodluck Jonathan ekwuola uche ya n’ihe gbasara ebubo Busola Dakolo boro Ụkọchukwu Biodun Fatoyinbo nke COZA.

N’uche Reno, o kwuru na ihe Busola kwuru adabaghị dịka eziokwu. O kwuru na ya enweghi mmasị n’ebe Biodun nọ, mana ihe Busola na-akọ eyighi eziokwu. Nke a bụ ihe ndi ọ kọwara:

Nke mbu: Ụkọchukwu bịara n’ụlọ nwa agbọghọ a, kụọ aka, nwagbọghọ a emepe ụzọ. Ụkọchukwu abata n’eleghi ma e nwere onye nọ n’ụlọ wee malite iwakpo nwagbọghọ a. Reno kwuru na nke a abụghị otu ihe si eme.

Nke abụọ: oge ụkọchukwu wakporo nwagbọghọ a, nwagbọghọ a emeghi ihe ọ bụla. Ụkọchụkwu a gaa n’ụgbọala wepụta mmanya, bata n’ụlọ nye ya nwagbọghọ a, ọ nara ya ṅụọ. Reno kwuru na nke a adabaghị adaba.

Nke atọ: Ụkọchukwu Biodun yiri m onye aghụghọ kama o nweghi onye ọ bụla ga-aga n’ụlọ nne na nna nwata ọ bụla ga wakpo nwa ha mgbe ụmụnne nwata ndi a nọ n’ụlọ; mechaa ihe ọjọọ ma gaa n’ụgbọala weta mmanya ma o nweghi onye pụtaranụ. Reno kwuru na nke a nwere ike ime naanị ma o ji ọgwụ jide ha.

Otu Busola siri kọọ akụkọ ije ya na Biodun Fatoyinbo ka Reno kwuru yiri nkata akpara akpa.

Leave a Reply