FeaturedIgbo News

Aka m bụ Omeiwu na-anọchite anya Anambra South-  Ifeanyi Ubah

Views

Onye omeiwu na-anọchite anya Anambra South n’ụlọ omeiwu dị n’Abuja emeela ka ọhanaeze mara na ọ ka nọ dika onye omeiwu na-anọchite anya Anambra South.

Ozi gara n’isi ụtụtụ Fraide kwuru na eke eriela isi nwa amadi a n’ụlọ omeiwu, Sen. Dr. Patrick Ifeanyi Ubah were mee ka a mara na ya bụ ozi bụ akụkọ mbe agaba.

O mere ka a mara na ọ bụ nanị na ndị ụlọikpe ekwebeghi ekwugharị ihe ha kwuru n’oge gara aga nke achọpụtarala eziokwu.

N’Okwu nke ya, Sen. Dr. Ifeanyi Ubah kwuru; ”…akụkọ ọbụla na-ekwu na achụọla m n’ọkwa Omeiwu Anambra South abụghị eziokwu. Aka m bụ Omeiwu na-anọchite anya Anambra South n’ụlọ Omeiwu n’ Abuja…”

Leave a Reply