FeaturedIgbo News

Aka akparala onye oziọma zuru ohi n’Ibadan

Views

Onye oziọma nke aha ya bụ Mz. Akinjide Durojaiye ka egburu ilu na Tọzde n’ihi na o zuru chara chara ekwenti Tecno abụọ nke ruru puku naira iri asaa n’ụlọ ahịa di n’ime ụlọ Femi Johnson nke di na Dugbe, Ibadan.

Onye ozi a kwuru na o si Dominion Assembly nke dị n’Ilare-Ijesa, Osun State bia igbasa ozioma n’ụlọ ahịa ebe a na-ere ekwenti na ngwa ya. O kwuru na ọ bụ mmụọ nsọ nyere ya ntuziaka iga na ya bụ ụlọ ahia.

Otu onye na-ere ahia n’ụlọ ahịa ahụ, Tunde, kwuru na ha ahụghị mgbe onye ozi a were ekwenti ndi ahụ n’ihi na obi ha tọrọ n’okwu chukwu ọ na-agwa ha.

Mgbe ejidere nwoke a, a kụrụ ya ihe tinka kụrụ panụ.

Onye ozi a kwuru na ọ bụ ekwensu tinyere ụdị echiche n’isi, tinyekwara nwa ya di afọ asaa nke si n’ụlọ elu daa.

E mechara hapụ nwoke a mgbe ndi mmadu bịara tinye ọnụ n’okwu ahụ.

Leave a Reply