FeaturedIgbo News

Aka akparala onye na-arụ n’ụlọ akụ zuru #137m

Views

Ndi Economic and Financial Crimes Commission, nke dị n’Ibadan, anwụchiela otu Kehinde  Olumide Agbabiaka, onye na-erere ndi Fidelity Bank ahịa.

Anwụchiri nwokorobịa mgbe a natara akwụkwọ ozi, site n’aka Regional Security Officer na Cluster Control na Compliance Manager nke ụlọ akụ a, ebe eboro nwoke ebubo maka izu otu nde nari naira na puku iri atọ na asaasite na akaụntụ onye ahia ha.

Agbabiaka, onye bụ ‘account officer’ onye ahịa a, na-aga ebe nwoke a na-ere ahịa, na-anara ya ego kwa izu. Ego a ọ na-anakọ bụ nke ekwesiri itinye n’akaụntụ nwoke a.

Mana, Agbabiaka na-etinye ego ndi a n’ime akpa ya; mgbe ọ bụla ọ masịrị ya, ọ kwunye ego ahụ n’akaụntụ nwoke a. Ihe a ka Agbabiaka na-eme kemgbe ọnwa Januarị, 2017.

Iji kpuchie agwa ọjọọ, nwoke a na-enye nwoke a akwụkwọ akụ adigboroja, iji gosi na ọ kwunyela ya bụ ego.

Agbabiaka ji ego a o nwetara zụọ ụlọ, ụgbọala na ihe enwe enwe ndi ọzọ. O binyekwara ụfọdụ mmadu ego; a natachara ya ihe niile o ji ego a zụọ.

Ndi EFCC kwuru na a ga-akpọpụ nwoke a ụlọ ikpe ma emechaa nyochaa.

Leave a Reply