FeaturedIgbo News

Aka akparala nwa akwụkwọ UNN gburu nwa akwụkwọ ibe ya

Views

Ndi uwe ojii nke Enugu Steeti ejidela nwa akwụkwọ nọ afọ nke abụọ na Mahadum nke Nigeria, Nsukka, nke aha ya bụ Asogwa Nnamdi, onye gburu nwata akwụkwọ ọzọ, a na-akpọ Chukwudi Mba, onye nọ afọ nke anọ n’ otu mahadum a.

E kwuru na Nnamdi magburu Mba mgbe ha na-aba mba maka ụgwọ ọkụ enyere ha n’ebe obibi ha.

Onye uweojii na-ahụ maka mmekọrita ọhanaeze, SP Ebere Amaraizu, kwuru na Fraide na-anwụchiela onye a gburu mmadụ ma kwuo na ebidola inyocha ya bụ okwu. O kwuru na ndi uwe ojii achọpụtabeghi ihe mere ya bụ ede jiri bee nwii.

Amaraizu kwuru na Kọmishọna nke ndi uwe ojii, Balarabe Suleiman, akpọọla ndi uwe ojii ka ha nyochaa ihe a merenu ma kwuo na etinyela ozu nwata akwụkwọ ebe a na-edosa ozu.

Leave a Reply