FeaturedIgbo News

Aka akpara Agadi ekwe nka dị Afọ 60 wakporo Nwata Nwaanyị dị Afọ 11

Views

Ụlọikpe magistrate dị na Lagos amala otu Akpan Sunday (60) ikpe maka ịwakpo na imerụ nwata nwaanyị dị nanị afọ 11 na-ere azụ.

Dịka ndị Daily post siri kọwa, nwoke a rịọrọ na aka ya dị ọcha na ya bụ ebubo.

Ọkaikpe ASP Nurudeen Thomas, onye na-ekwuchitere nwata nwaanyị ọnụ ya, mere ka a mara na nwoke a mere ya bụ arụ n’elekere 10 n’ụtụtụ ka ọnwa Julaị gbara 15 n’ụlọ ya dị na Bariga, Lagos.

O mere ka a matakwa na o ji igo azụ  ghọrị nwatakịrị a mere ka o soro ya baa be ya ịnara ego azụ ya.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ya bụ nwoke dara iwu dị na Section 137 nke Iwu na echekwa Lagos steeti, 2015.

Ka o sila dị, ọkaikpe na-ahụ maka ya bụ ikpe bụ Magistrate P. E. Nwakpa gwara onye e boro ebubo na ọ ga-eji 200, 000naịra wee gbara onwe ya.

5 Comments

Leave a Reply