FeaturedIgbo News

Aga m alọta Naịjiria maka akwamozu nne na nna m – Nnamdi Kanu

Views

Onye nnọchite anya ma bụrụkwa onyeisi ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ọ ga-alọta Naijiria maka akwamozu nne na nna ya akanyere na February 14, 2020. O mere ka a mara nke a n’ụbọchị Fraịde.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị IPOB, Emma Powerful mere ka a mara na a ga-akwa nne na nna Nnamdi Kanu n’usoro omenaaala ha siri dị.

Nna nnamdi Kanu, Eze Israel Kanu nwụrụ ọnwa anọ ka nwunye ya Ugoeze Sally Kanu nwụchara. A ga-akwanyere ha abụọ ugwu ikpeazụ ma ọnwa Febụwarị gbaa 14.

N’okwu Emma Powerful, ”anyị agbaghị agwa ndị mmadụ ka anyị siri kwado, mana anyị kwadoro nke ọma maka na anyị ma na ndị ntisa karịrị akarị…”

”Ndị IPOB ga-agba mbọ niile ichekwa onye ọbụla”

”Udo ka anyị jiri bịa, n’udo ka anyị ga-akwụgidekwa”

 

Leave a Reply